3 Sị ya, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m na-emegide gị, gị ógbè Sia+ bụ́ ugwu ugwu, m ga-esetị aka m mee gị ihe,+ meekwa ka ị bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu, ee, ebe tọgbọrọ nkịtị.+
4 “M ga-esetịkwa aka m mee Juda na ndị niile bi na Jeruselem ihe,+ m ga-ebipụkwa ndị fọdụrụ n’ime ndị na-efe Bel n’ebe a,+ bipụkwa aha ndị nchụàjà nke chi ala ọzọ, tinyere ndị ọzọ bụ́ ndị nchụàjà,+