29 “Aṅụrịla ọṅụ,+ gị Filistia,+ ka onye ọ bụla n’ime gị ghara ịṅụrị ọṅụ naanị n’ihi na a gbajiwo mkpara nke onye na-apịa gị ihe.+ N’ihi na agwọ ọjọọ+ ga-esi na mgbọrọgwụ agwọ+ pụta, mkpụrụ ya ga-abụkwa agwọ na-acha ọkụ ọkụ nke na-efe efe.+
20 na ìgwè mmadụ dum gwara ọgwa, na ndị eze niile nke ala Ọz,+ na ndị eze niile nke ala ndị Filistia+ na Ashkelọn+ na Geza+ na Ekrọn+ na ndị fọdụrụ n’Ashdọd;+
4 “Oleekwa ihe jikọrọ mụ na unu, Taya na Saịdọn+ na unu ógbè niile nke Filistia?+ Ọ̀ bụ mmeso a ka unu ji na-akwụ m ụgwọ? Ọ bụrụkwa otú a ka unu na-emeso m, m ga-akwụ unu ụgwọ mmeso unu ngwa ngwa, n’egbughị oge.+