15 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na ndị Filistia abọwo ọbọ,+ ha wee jiri ịkwa emo nke dị ná mkpụrụ obi ha na ibu iro nke na-adịru mgbe a na-akaghị aka+ na-abọrọ onwe ha ọbọ, iji weta mbibi.+
8 M ga-ebipụ onye bi n’Ashdọd,+ bipụkwa onye ji mkpanaka eze n’Ashkelọn.+ M ga-eme ka aka m bịakwasị+ Ekrọn,+ ndị fọdụrụ ná ndị Filistia ga-alakwa n’iyi,”+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’
5 “Ahụhụ ga-adịrị ndị bi n’ógbè oké osimiri, bụ́ mba ndị Keretaịt!+ Okwu Jehova na-emegide unu. Gị Kenan, bụ́ ala ndị Filistia, m ga-ebibikwa gị, ka a ghara inwe onye ga-ebi n’ime gị.+