24 N’ihi na ihe niile dị n’akụkụ nke a nke Osimiri Yufretis+ dị n’okpuru ya, malite na Tifsa ruo Geza,+ ọbụna ndị eze niile nọ n’akụkụ nke a nke Osimiri Yufretis;+ o nwekwara udo+ n’ógbè ya niile, gbaa gburugburu.
6 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘“N’ihi nnupụisi atọ nke Geza nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ, n’ihi na ha kpọọrọ ìgwè ndị niile a dọọrọ n’agha+ kpọnye Idọm.+
5 Ashkelọn ga-ahụ nke a wee tụọ egwu; Geza ga-enwekwa oké ihe mgbu; Ekrọn+ ga-enwekwa oké ihe mgbu n’ihi na ihere ga-eme ebe olileanya ya dị.+ Eze ga-anwụkwa na Geza, mmadụ agaghịkwa ebi n’Ashkelọn.+