17 Ha wee gbagote na Juda wee waba n’ime ya ma kwakọrọ akụ̀ niile dị n’ụlọ eze,+ dọrọkwa ụmụ ya ndị ikom na ndị nwunye ya n’agha,+ ọ dịghị nwa nwoke ọ bụla a hapụụrụ ya ma e wezụga Jehoahaz,+ bụ́ ọdụdụ nwa ya.
18 Ma ndị Filistia+ wakporo obodo ndị dị na Shefila+ na Negeb+ nke Juda wee weghara Bet-shimesh+ na Aịjalọn+ na Gedirọt+ na Soko+ na obodo nta ya niile, na Timna+ na obodo nta ya niile, na Gimzo na obodo nta ya niile; ha wee biri n’ebe ahụ.