29 “Aṅụrịla ọṅụ,+ gị Filistia,+ ka onye ọ bụla n’ime gị ghara ịṅụrị ọṅụ naanị n’ihi na a gbajiwo mkpara nke onye na-apịa gị ihe.+ N’ihi na agwọ ọjọọ+ ga-esi na mgbọrọgwụ agwọ+ pụta, mkpụrụ ya ga-abụkwa agwọ na-acha ọkụ ọkụ nke na-efe efe.+
4 n’ihi ụbọchị nke na-abịa bụ́ nke a ga-ebibi ndị Filistia niile,+ bụ́ ụbọchị a ga-ebipụ onye ọ bụla fọdụrụ nke na-enyere Taya+ na Saịdọn+ aka.+ N’ihi na Jehova ga-ebibi ndị Filistia,+ bụ́ ndị fọdụrụ n’ime ndị si n’agwaetiti Kaftọ.+
16 Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m na-esetị aka m ime ndị Filistia+ ihe, m ga-ebipụ ndị Keretaịt,+ bibiekwa ndị niile ọzọ bi n’ụsọ oké osimiri.+
5 “Ahụhụ ga-adịrị ndị bi n’ógbè oké osimiri, bụ́ mba ndị Keretaịt!+ Okwu Jehova na-emegide unu. Gị Kenan, bụ́ ala ndị Filistia, m ga-ebibikwa gị, ka a ghara inwe onye ga-ebi n’ime gị.+