27 Osisi ndị dị n’ọhịa ga-amị mkpụrụ,+ ala ha ga-emepụtakwa ihe nke ọma,+ ha ga-anọkwa n’ala ha n’obi iru ala.+ Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m gbajiri osisi yok+ ha wee napụta ha n’aka ndị ji ha na-agba ohu.+
35 Ndị mmadụ ga-asịkwa: “Ala ahụ dị ebe ahụ nke bụbu ebe tọgbọrọ n’efu adịla ka ogige Iden,+ obodo ndị ahụ bụbu mkpọmkpọ ebe, ndị e mekwara ka ha tọgbọrọ n’efu, ndị e tidakwara etida, abụrụwo ebe e wusiri ike; e biriwo na ha.”+