2 Ọ ghaghị ịwa okooko,+ ọ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ.+ A ga-enye ya ebube nke Lebanọn,+ na ịma mma nke Kamel+ na nke Sharọn.+ A ga-enwe ndị ga-ahụ ebube Jehova,+ bụ́ ịma mma nke Chineke anyị.+
12 “N’ihi na unu ga-eji ọṅụ pụta,+ a ga-ejikwa udo kpọbata unu.+ Ugwu ukwu na ugwu nta ga-eti mkpu ọṅụ n’ihu unu,+ osisi niile dị n’ọhịa ga-akụkwa aka.+