23 Ọ ga-emekwa ka mmiri zooro mkpụrụ ị kụrụ n’ala,+ nyekwa gị ihe oriri dị ka mkpụrụ nke ala, bụ́ nke ga-ama abụba, gbaakwa mmanụ.+ Anụ ụlọ gị ga-ata nri n’ụbọchị ahụ n’ebe ịta nri nke sara mbara.+
23 Unu ụmụ Zayọn, ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova bụ́ Chineke unu;+ n’ihi na ọ ghaghị ime ka unu nwee ụbịa mmiri otú o kwesịrị.+ Ọ ga-emekwa ka oké mmiri ozuzo zooro unu, ụbịa mmiri na ụla mmiri, dị ka ọ na-ezo na mbụ.+
7 “‘Mụ onwe m kwa gbochiri oké mmiri ozuzo izoro unu mgbe ọ fọrọ ọnwa atọ ka oge owuwe ihe ubi ruo;+ m mekwara ka mmiri zoo n’otu obodo, ma emeghị m ka mmiri zoo n’obodo ọzọ. Mmiri zoro n’otu ibé ala, ma ibé ala nke m na-emeghị ka mmiri zoo na ya kpọrọ nkụ.+