22 Sị ya, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m na-emegide gị,+ Saịdọn, a ga-enyekwa m otuto n’ime gị;+ ndị mmadụ ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m mere ihe e kpere n’ikpe+ n’ime ya, e wee doo m nsọ n’ime ya.+
16 Ị ga-abịakwa ibuso ndị m Izrel agha, ka i kpuchie ala ha dị ka ígwé ojii.+ N’oge ikpeazụ ka ọ ga-eme. M ga-eme ka ị bịakwasị ala m,+ ka mba niile wee mara m mgbe m doro onwe m nsọ n’ebe ị nọ, n’ihu ha, gị Gọg.”’+