14 “Ugbu a, lee! Ọ bụ ọnwụ na-echezi m ihu taa.+ Unu jikwa obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum mara nke ọma na ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu. Ọ dịghị otu ihe n’ime ha nke na-emezughị.+
10 Onye na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ,+ onye na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.+ Onye na-asị, ‘Ihe m kpebiri ga-adịgide,+ ọ bụkwa ihe niile dị m ụtọ ka m ga-eme’;+
11 otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị.+ Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m,+ kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ,+ ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.+