7 “M ga-edebe ọgbụgba ndụ m nke dị n’etiti mụ na gị+ na mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị n’ọgbọ ha niile ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ruo mgbe a na-akaghị aka,+ ka m wee gosi na m bụ Chineke gị nakwa Chineke nke mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị.+
7 M ga-enye ha obi ha ga-eji mara m,+ na mụ onwe m bụ Jehova; ha ga-abụ ndị m,+ mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha, n’ihi na ha ga-eji obi ha dum lọghachikwute m.+
10 “‘N’ihi na nke a bụ ọgbụgba ndụ nke mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị,’ ka Jehova sịrị. ‘M ga-etinye iwu m n’uche ha, m ga-edekwa ya n’ime obi ha.+ M ga-abụkwa Chineke ha,+ ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.+