5 Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-erube nnọọ isi+ n’ihe m kwuru ma debe ọgbụgba ndụ m n’ezie,+ unu ga-aghọ ihe onwunwe m pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ,+ n’ihi na elu ụwa dum bụ nke m.+
31 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị bụ Chineke ebere.+ Ọ gaghị agbahapụ gị ma ọ bụ laa gị n’iyi ma ọ bụ chefuo ọgbụgba ndụ+ nna nna gị hà nke ọ ṅụụrụ ha n’iyi.
2 “Gaa jiri oké olu gwa Jeruselem, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru:+ “Echetara m nke ọma obiọma* i nwere n’oge ị bụ nwa agbọghọ+ na ịhụnanya i nwere n’oge m kwere nkwa ịlụ gị,+ na otú i si na-eso m n’ala ịkpa, n’ala a na-aghaghị mkpụrụ ọ bụla.+