6 N’ihi na a mụworo anyị otu nwa,+ e nyewokwa anyị otu nwa nwoke;+ ịchịisi ga-adị n’ubu ya.+ A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,+ Chineke nke bụ́ Dike,+ Nna Mgbe Ebighị Ebi,+ Onyeisi Udo.+
17 Ọ bụ ndị nche+ nyere iwu a; ọ bụkwa ndị nsọ kwuru ka e mee ihe a; ka ndị dị ndụ wee mara na Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ,+ ọ bụkwa onye ọ chọrọ inye ya ka ọ na-enye ya,+ ọ na-emekwa ka onye kasị ala n’etiti ụmụ mmadụ na-achị ya.”+
11 “‘N’ụbọchị ahụ, m ga-ebuli+ ụlọ ndò+ Devid nke dara ada,+ m ga-edozikwa ebe ndị a kwadara akwada. M ga-ewu mkpọmkpọ ebe ya, m ga-ewuli ya elu dị ka ọ dị n’ogologo oge gara aga,+