33 Fero Niko+ wee tụọ ya mkpọrọ+ na Ribla+ n’ala Hemat, iji gbochie ya ịchị na Jeruselem, o wee rie ala ahụ iwu+ otu narị talent ọlaọcha+ na otu talent ọlaedo.+
4 Eze+ Ijipt mekwara Elayakim+ nwanne ya nwoke eze Juda na Jeruselem ma gbanwee aha ya ka ọ bụrụ Jehoyakim. Ma Niko+ kpọọrọ Jehoahaz nwanne ya nwoke kpọta Ijipt.+
11 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere Shalọm+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, onye na-achị n’ọnọdụ Josaya nna ya,+ bụ́ onye si ebe a pụọ, ‘Ọ gaghị alọta ebe a ọzọ.