8 O wee ruo n’ụtụtụ na mmụọ ya ezughị ike.+ O wee zie ozi kpọọ ndị niile na-eme anwansi n’Ijipt+ na ndị amamihe ya niile,+ Fero wee kọọrọ ha nrọ ya.+ Ma e nweghị onye kọwaara Fero nrọ ndị ahụ.
2 Eze wee kwuo ka a kpọọ ndị dibịa anwansi+ na ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ na ndị dibịa afa na ndị Kaldia ka ha bịa kọọrọ eze nrọ ọ rọrọ.+ Ha wee bata guzo n’ihu eze.