-
Daniel 2:10Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
10 Ndị Kaldia ahụ wee sị eze: “Ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’elu ala nke nwere ike ịkọrọ eze ihe a ọ chọrọ, n’ihi na e nwetụbeghị eze ma ọ bụ gọvanọ kwuru ka dibịa anwansi ma ọ bụ onye na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ onye Kaldia mee ihe dị otú a.
-
-
Daniel 5:7Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
7 Eze wee were oké olu tie mkpu ka a kpọtara ya ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ, ndị Kaldia na ndị na-agụ kpakpando.+ Eze wee gwa ndị amamihe nke Babịlọn, sị: “Nwoke ọ bụla nke ga-agụ ihe a e dere ma kọọrọ m isi ya, a ga-eyiwe ya uwe na-acha odo odo,+ yinye ya ihe olu ọlaedo n’olu, ọ ga-achịkwa dị ka onye nke atọ n’alaeze a.”+
-