48 Eze wee mee ka Daniel bụrụ onye ukwu,+ o nyekwara ya ọtụtụ nnukwu onyinye, o mekwara ka ọ bụrụ onye na-achị ógbè Babịlọn dum+ a na-achị achị nakwa prifekt bụ́ onyeisi ndị amamihe niile nke Babịlọn.
9 “‘Belteshaza, onyeisi nke ndị dibịa anwansi,+ ebe m maara nke ọma na mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ dị n’ime gị+ nakwa na ọ dịghị ihe nzuzo ọ bụla na-esiri gị ike,+ gwa m ọhụụ m hụrụ mgbe m na-arọ nrọ, kọọkwara m isi ha.+