30 Gee ntị n’arịrịọ ohu gị na-arịọ ka i meere ya amara+ nakwa nke ndị gị Izrel chere ihu n’ebe a na-arịọ; gị onwe gị nọrọkwa n’ebe obibi gị n’eluigwe nụrụ,+ nụrụ ya ma gbaghara.+
44 “Ọ bụrụ na ndị gị agaa ibuso ndị iro ha agha+ n’ebe i zigara ha,+ ha ewee chee ihu n’obodo a ị họọrọ+ nakwa n’ụlọ a m wuuru aha gị+ wee kpekuo Jehova ekpere,+
38 ha ewee nọrọ n’ala ebe ndị dọọrọ ha n’agha ji ha eji+ wee jiri obi ha dum+ na mkpụrụ obi ha dum lọghachikwute gị, ha ewee chee ihu n’ala ha bụ́ nke i nyere ndị nna nna ha, nakwa n’obodo ị họọrọ,+ nakwa n’ụlọ a m wuuru aha gị,+ kpekuo gị ekpere;