41 “Ebe ị hụkwara na ihe e ji kpụọ ala ala ụkwụ ya na mkpịsị ụkwụ ya bụ ụrọ ọkpụite ji akpụ ihe nakwa ígwè,+ alaeze ahụ ga-ekewa ekewa,+ ma ọ ga-esitụ ike dị ka ígwè, ebe ọ bụ na ị hụrụ na a gwakọtara ígwè na ụrọ dị mmiri.+
8 M nọ na-eche banyere mpi ndị ahụ, ma, lee! mpi ọzọ, nke dị ntakịrị,+ pulitere n’etiti ha, e fopụkwara atọ n’ime mpi ndị mbụ ahụ n’ihu ya. Ma, lee! e nwere anya ndị yiri anya mmadụ na mpi a, e nwekwara ọnụ nke na-etu ọnụ.+