2 N’ụbọchị ahụ, ihe Jehova mere ka o pulite+ ga-aghọ ihe ịchọ mma na ihe na-eweta otuto,+ mkpụrụ nke ala ga-aghọkwara ndị Izrel lanahụrụ alanahụ+ ihe e ji anya isi+ na ihe mara mma.
6 N’ụbọchị ahụ, m weliri aka m+ ṅụọrọ ha iyi na m ga-akpọpụta ha n’ala Ijipt kpọga ha n’ala m ledooro ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.+ Ọ bụ ihe e ji chọọ ala niile mma.+
16 Onye na-abịa ibuso ya agha ga-eme uche ya, o nweghịkwa onye ga-eguzo n’ihu ya. Ọ ga-eguzokwa n’ala nke Ihe Ịchọ Mma,+ mkpochapụ ga-adịkwa n’aka ya.+
45 Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya nke dị ka obí eze n’agbata nnukwu oké osimiri na ugwu nsọ nke Ihe Ịchọ Mma;+ ọ ga-abịarukwa ọgwụgwụ ya,+ ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.+