Aịzaya
4 Ụmụ nwaanyị asaa ga-abagide otu nwoke n’ụbọchị ahụ,+ sị: “Anyị ga na-akpa afọ anyị, na-eyikwa uwe anyị; naanị ka anyị zawa aha gị iji wepụ nkọcha anyị.”+
2 N’ụbọchị ahụ, ihe Jehova mere ka o pulite+ ga-aghọ ihe ịchọ mma na ihe na-eweta otuto,+ mkpụrụ nke ala ga-aghọkwara ndị Izrel lanahụrụ alanahụ+ ihe e ji anya isi+ na ihe mara mma. 3 Ọ ga-erukwa na a ga-asị na ndị fọdụrụ na Zayọn na ndị fọrọ na Jeruselem dị nsọ n’ebe ọ nọ,+ onye ọ bụla e dere aha ya ịdị ndụ na Jeruselem.+
4 Mgbe Jehova ga-asachapụworị nsị ụmụ Zayọn,+ ọ ga-eji mmụọ nke ikpe na mmụọ nke ịgba ihe ọkụ+ sachapụ+ ọbara niile a wụfuru+ n’ime Jeruselem, 5 Jehova ga-emekwa ka e nwee ígwé ojii na anwụrụ ọkụ n’ehihie, na ìhè nke ọkụ na-enwu enwu+ n’abalị+ n’elu ebe niile guzosiri ike nke Ugwu Zayọn+ nakwa n’ebe a na-enwe mgbakọ na ya; n’ihi na a ga-enwe ihe mkpuchi iji chebe ebube ya dum.+ 6 A ga-enwekwa ụlọ ndò nke ga na-enye ndò n’ehihie iji zere oké okpomọkụ,+ ọ ga-abụkwa ebe mgbaba na ebe izere oké ifufe mmiri na mmiri ozuzo.+