6 N’ụbọchị ahụ, m weliri aka m+ ṅụọrọ ha iyi na m ga-akpọpụta ha n’ala Ijipt kpọga ha n’ala m ledooro ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.+ Ọ bụ ihe e ji chọọ ala niile mma.+
41 Ọ ga-abanyekwa+ n’ala nke Ihe Ịchọ Mma,+ a ga-emekwa ka ọtụtụ ala daa.+ Ma, ọ bụ ala ndị a ga-agbapụ n’aka ya, Idọm na Moab+ na akụkụ bụ́ isi n’ụmụ Amọn.
45 Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya nke dị ka obí eze n’agbata nnukwu oké osimiri na ugwu nsọ nke Ihe Ịchọ Mma;+ ọ ga-abịarukwa ọgwụgwụ ya,+ ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.+