3 n’afọ nke atọ nke ọchịchị ya, o meere ndị niile o mere ndị isi oriri,+ tinyere ndị niile na-ejere ya ozi, ndị agha Peshia+ na Midia,+ ndị a ma ama+ na ndị isi nke ógbè dị iche iche bụ́ ndị guzo n’ihu ya,+
28 Onye na-ekwu banyere Saịrọs,+ sị, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ọ ga-eme ihe niile na-atọ m ụtọ;+ ọ ga-eme ọbụna ihe m kwuru banyere Jeruselem, sị, ‘A ga-ewughachi ya,’ na ihe m kwuru banyere ụlọ nsọ ya, sị, ‘A ga-atọ ntọala gị.’”+
“Lee! E nwere ndị eze atọ ka ga-ebiliri Peshia,+ nke anọ+ ga-akpakọba akụnụba karịa ndị nke ọzọ niile.+ Ozugbo akụnụba ya mere ka ọ dị ike, ọ ga-akpali ihe niile imegide alaeze Gris.+