5 “Ohola wee malite ịgba akwụna,+ mgbe ọ nọ n’okpuru m, na-enwekwa agụụ ka ya na ndị ya na ha na-eme enyi nwee mmekọahụ,+ ya bụ, ndị Asiria,+ bụ́ ndị nọ ya nso,
12 Ndị m na-ajụ arụsị ha+ e ji osisi mee ase,+ mkpara ha na-agwakwa ha okwu; n’ihi na mmụọ ịkwa iko emewo ka ha kpafuo,+ ịkwa iko emewokwa ka ha si n’okpuru Chineke pụọ.+