Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ndị Eze 15:19
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 19 Pul+ eze Asiria+ batara n’ala ahụ. N’ihi ya, Menahem nyere+ Pul otu puku talent ọlaọcha,+ ka o wee nyere ya aka mee ka alaeze ahụ guzosie ike n’aka ya.+

  • 2 Ndị Eze 16:7
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 7 Ehaz wee zigara Tiglat-piliza+ eze Asiria ndị ozi, sị: “Abụ m ohu gị,+ bụrụkwa nwa gị. Gbagote zọpụta+ m n’ọbụ aka eze Siria nakwa n’ọbụ aka eze Izrel, bụ́ ndị na-ebuso m agha.”

  • 2 Ndị Eze 17:3
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 3 Ọ bụ ya ka Shalmaniza+ eze Asiria+ gbagotere buso agha, Hoshia wee ghọọ ohu ya ma malite ịtụrụ ya ụtụ.+

  • Jeremaya 2:18
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 18 Gịnị mere i ji nwee mmasị n’ụzọ e si aga Ijipt+ ka i wee ṅụọ mmiri Shaịhọ?+ Gịnịkwa mere i ji nwee mmasị n’ụzọ e si aga Asiria+ ka i wee ṅụọ mmiri Osimiri Yufretis?

  • Jeremaya 2:36
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 36 Gịnị mere i ji were ịgbanwe ụzọ gị dị ka obere ihe?+ Ihere Ijipt ga-emekwa gị,+ dị nnọọ ka ihere Asiria mere gị.+

  • Abụ Ákwá 5:6
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    •  6 Anyị na-asaghere Ijipt+ aka;+ anyị na-asaghekwara Asiria aka+ ka ha nyejuo anyị nri afọ.

  • Ezikiel 16:28
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 28 “‘I wee gbara akwụna gakwuru ndị ikom Asiria n’ihi na ọ naghị eju gị eju,+ gị na ha nọ na-akwa iko, ọ naghịkwa eju gị eju.

  • Hosia 5:13
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 13 “Ifrem wee hụ ọrịa ọ na-arịa, Juda hụkwara ọnyá ya.+ Ifrem wee gaa Asiria+ zigara eze ukwu+ ndị ozi. Ma onye ahụ agwọlighị unu,+ ọ pụghịkwa ime ka ọnyá unu laa.+

  • Hosia 7:11
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 11 Ifrem dị ka nduru dị nzuzu+ nke na-enweghị uche.+ Ha akpọkuwo Ijipt;+ ha agakwuruwo Asiria.+

  • Hosia 8:9
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 9 N’ihi na ha onwe ha agbagowo Asiria,+ dị ka ịnyịnya ọhịa nke nọ naanị ya.+ Ma Ifrem egowo ndị hụrụ ya n’anya.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya