45 “Nkọcha ndị a niile+ ga-abịakwasịkwa gị, chụọ gị ọsọ ma chụkwute gị ruo mgbe a lara gị n’iyi,+ n’ihi na i geghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị site n’idebe iwu ya na ụkpụrụ ya ndị o nyere gị.+
14 Hezekaya eze Juda wee zigara eze Asiria ozi na Lekish, sị: “Emehiewo m. Laghachi, ebusola m agha. Ibu ọ bụla ị ga-ebo m, m ga-ebu ya.”+ Eze Asiria wee manye Hezekaya eze Juda ịkwụ narị talent+ ọlaọcha atọ na talent ọlaedo iri atọ.
24 A na-emekwa ka unu mara na a gaghị ana ndị nchụàjà+ na ndị Livaị,+ ndị egwú,+ ndị nche ọnụ ụzọ,+ ndị Netinim,+ na ndị niile na-arụ ọrụ n’ụlọ Chineke nke a, ụtụ isi, ụtụ ahịa+ ma ọ bụ ụtụ ụzọ.+