19 Pul+ eze Asiria+ batara n’ala ahụ. N’ihi ya, Menahem nyere+ Pul otu puku talent ọlaọcha,+ ka o wee nyere ya aka mee ka alaeze ahụ guzosie ike n’aka ya.+
5 “Ohola wee malite ịgba akwụna,+ mgbe ọ nọ n’okpuru m, na-enwekwa agụụ ka ya na ndị ya na ha na-eme enyi nwee mmekọahụ,+ ya bụ, ndị Asiria,+ bụ́ ndị nọ ya nso,
13 “Ifrem wee hụ ọrịa ọ na-arịa, Juda hụkwara ọnyá ya.+ Ifrem wee gaa Asiria+ zigara eze ukwu+ ndị ozi. Ma onye ahụ agwọlighị unu,+ ọ pụghịkwa ime ka ọnyá unu laa.+
12“Ifrem na-eri ifufe,+ na-achụsokwa ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ ogologo ụbọchị dum.+ Ọ na-agha ụgha nke ukwuu, na-ebukọrọkwa ihe ndị mmadụ.+ Ha na Asiria agbawo ndụ,+ ha butekwaara Ijipt mmanụ.