Abụ Ákwá
5 Jehova, biko, cheta ihe mere anyị.+ Lee anya hụ nkọcha a kọchara anyị.+
2 E werewo ihe nketa anyị nyefee ndị ala ọzọ, werekwa ụlọ anyị nyefee ndị mba ọzọ.+
3 Anyị aghọwo ụmụ mgbei na-enweghị nna.+ Nne anyị hà dịzi ka ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ.+
4 Mmiri anyị ka anyị na-ejizi ego azụrụ.+ Nkụ anyị ka anyị na-akwụ ụgwọ iji nweta.
5 Ọ fọla ntakịrị ka ndị na-achụ anyị jide anyị.+ Ike agwụla anyị. Ezumike adịrịghị anyị.+
6 Anyị na-asaghere Ijipt+ aka;+ anyị na-asaghekwara Asiria aka+ ka ha nyejuo anyị nri afọ.
7 Ọ bụ ndị nna nna anyị mehiere.+ Ha anọkwaghị. Anyị na-ata ahụhụ njehie ha.+
8 Ọ bụ ndị ohu na-achị anyị.+ Ọ dịghị onye na-anapụta anyị n’aka ha.+
9 Anyị na-etinye mkpụrụ obi anyị n’ihe ize ndụ iji nweta ihe anyị ga-eri,+ n’ihi mma agha nke dị n’ala ịkpa.
10 Akpụkpọ ahụ́ anyị adịwo ọkụ dị ka ekwú ọkụ, n’ihi ụfụ ịnọ agụụ na-afụ.+
11 Ha metọrọ ndị nwunye nọ na Zayọn,+ tinyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke nọ n’obodo ndị dị na Juda.
12 A kwụgbuola ndị isi site n’ịkwụwa naanị aka ha n’elu.+ A sọpụrụghị ọbụna ihu ndị agadi.+
13 Ọbụna ụmụ okorobịa eburula nkume igwe nri,+ ụmụ okoro bu nkụ na-adagbugharịkwa.+
14 Ndị agadi akwụsịwo ịnọ n’ọnụ ụzọ ámá,+ ụmụ okorobịa akwụsịwokwa egwú ha na-akụ.+
15 Obi anyị akwụsịwo ịṅụrị ọṅụ. Egwú anyị na-agba aghọwo naanị iru uju.+
16 Okpueze anyị kpu n’isi adapụla.+ Anyị efuola, n’ihi na anyị emehiewo!+
17 N’ihi ya, obi anyị na-arịa ọrịa.+ Anya anyị na-ahụzi inyoghi inyoghi n’ihi ihe ndị a,+
18 N’ihi ugwu Zayọn nke e mere ka ọ tọgbọrọ n’efu;+ nkịta ọhịa na-ejegharị na ya.+
19 Ma gị onwe gị, Jehova, ị ga-anọdụ n’ocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.+ Ọ ga-adịru ọgbọ niile.+
20 Gịnị mere i ji chefuo anyị ruo mgbe ebighị ebi,+ gịnịkwa mere i ji gbahapụ anyị ruo ọtụtụ ụbọchị?+
21 Jehova, biko, kpọghachite anyị+ n’ebe ị nọ, anyị ga-alọghachikwa ozugbo. Wetara anyị ụbọchị ọhụrụ dị ka n’ogologo oge gara aga.+
22 Otú ọ dị, ị jụwo anyị kpamkpam.+ I wesowo anyị iwe nke ukwuu.+