13 “‘Lee! Ụbọchị na-abịa,’ ka Jehova kwuru, ‘mgbe onye na-akọ ihe ga-ejekwute onye na-ewe ihe ubi,+ onye na-azọcha mkpụrụ vaịn ga-ejekwutekwa onye bu mkpụrụ ọ na-agha;+ mmanya dị ụtọ ga-esi n’ugwu ukwu na-atapụta,+ ugwu nta niile ga na-agbazekwa.+
17 Lee ka ịdị mma ya si dị ukwuu,+ leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu!+ Ọ bụ nri ga-eme ka ụmụ okorobịa na-eme nke ọma, mmanya ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke na-eme nke ọma.”+