18 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na mmanya dị ụtọ+ ga-esi n’ugwu na-atapụsị, mmiri ara ehi ga na-eru n’ugwu nta, mmiri ga na-asọ n’ọwa mmiri niile nke Juda. Isi iyi ga-esi n’ụlọ Jehova na-asọpụta,+ ọ ga na-edekwa Ndagwurugwu Osisi Akeshịa+ mmiri.
13 “‘Lee! Ụbọchị na-abịa,’ ka Jehova kwuru, ‘mgbe onye na-akọ ihe ga-ejekwute onye na-ewe ihe ubi,+ onye na-azọcha mkpụrụ vaịn ga-ejekwutekwa onye bu mkpụrụ ọ na-agha;+ mmanya dị ụtọ ga-esi n’ugwu ukwu na-atapụta,+ ugwu nta niile ga na-agbazekwa.+