20 O wee bịa dịrị n’agbata ndị agha ndị Ijipt na ndị Izrel.+ N’otu aka, ọ ghọrọ ígwé ojii na ọchịchịrị. N’aka nke ọzọ, ọ nọ na-enye ìhè n’abalị.+ Otu ìgwè abịarughị ìgwè nke ọzọ nso n’abalị ahụ dum.
30 Ha ga na-aba mba n’elu ya n’ụbọchị ahụ dị ka mbigbọ oké osimiri.+ Mmadụ ga na-ele ala a anya, ma, lee! e nwere ọchịchịrị na-agbawa obi;+ ọbụna ìhè agbawo ọchịchịrị n’ihi mmiri nke na-ezokwasị ya.
16 Nyenụ Jehova bụ́ Chineke unu otuto,+ tupu ya emee ka ọchịchịrị gbaa,+ tupu unu akpọbie ụkwụ n’ugwu mgbe chi jiri.+ Unu ga na-ele anya ìhè,+ ma ọ ga-eme ka oké ọchịchịrị gbaa;+ ọ ga-emekwa ka oké itiri gbachie.+