9 Ike agwụwo nwaanyị mụrụ ụmụ asaa; ọ na-esiri mkpụrụ obi ya ike ikute ume.+ Anyanwụ ya adawo n’ehihie;+ ihere emewo ya, e mechuwokwa ya ihu.’ ‘M ga-enyefe ndị fọdụrụ n’ime ha n’aka mma agha n’ihu ndị iro ha,’+ ka Jehova kwuru.”
6 ‘N’ihi ya, chi ga-ejiri unu,+ ka ọhụụ wee ghara ịdị;+ ọchịchịrị ga-agbachiri unu, ka unu wee ghara ịdị na-agba afa. Anyanwụ ga-ada n’ihi ndị amụma, chi ga-ejibido ha.+
29 “Ozugbo mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị,+ ọnwa+ agaghịkwa enye ìhè ya, kpakpando ga-esikwa n’eluigwe daa, a ga-emekwa ka ike nke eluigwe maa jijiji.+