11 E mesịa, eze Asiria+ dọọrọ Izrel n’agha+ laa Asiria, meekwa ka ha biri na Hela+ nakwa na Hebọ,+ nke dị n’akụkụ osimiri Gozan nakwa n’obodo dị iche iche nke ndị Midia,+
16 “A ga-ama Sameria ikpe,+ n’ihi na ọ na-enupụrụ Chineke ya isi.+ A ga-eji mma agha gbuo ha.+ A ga-akụri ụmụ ha,+ a ga-abọwakwa ndị inyom ha dị ime afọ.”+