12 “Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova rụchara ọrụ ya dum n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem, m ga-eme ka eze Asiria zaa ajụjụ maka ihe obi nganga ya rụpụtara nakwa maka mpako nke anya ya dị elu.+
7 Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ,+ ọ ga-asịkwa, ‘E bibiwo Ninive! Ònye ga-emetara ya ebere?’ Ebee ka m ga-achọta ndị ga-akasi gị obi?
13 “Ọ ga-esetị aka ya n’ebe ugwu, ọ ga-ebibikwa Asiria.+ Ọ ga-emekwa ka Ninive bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu,+ meekwa ka ógbè nke mmiri na-adịghị dị ka ala ịkpa.