24 “‘Dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Jehova kwuru, ‘Gị Konaya+ nwa Jehoyakim,+ bụ́ eze Juda, ọ bụrụgodị na ị bụ mgbaaka e ji aka ihe akara+ nke m gba n’aka nri, m ga-agbapụ gị n’ebe ahụ!+
27 Rụọnụ ọrụ, ọ bụghị iji nweta nri nke na-ala n’iyi,+ kama iji nweta nri na-adịgide adịgide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi,+ bụ́ nke Nwa nke mmadụ ga-enye unu; n’ihi na ọ bụ ya ka Nna m, bụ́ Chineke, kara akara nke na-egosi na ihe ya masịrị ya.”+
19 N’agbanyeghị nke ahụ, ntọala siri ike nke Chineke tọrọ na-eguzosi ike,+ ebe o nwere akara nke bụ́: “Jehova maara ndị bụ́ ndị ya,”+ nakwa: “Ka onye ọ bụla nke na-akpọ aha Jehova+ jụ ajọ omume.”+