15 Ma, ya doo unu anya na ọ bụrụ na unu egbuo m, ọ bụ ọbara na-emeghị ihe ọjọọ ka unu na-eme ka ọ dịrị n’isi unu nakwa n’isi obodo a nakwa n’isi ndị bi na ya,+ n’ihi na n’eziokwu, ọ bụ Jehova ziri m ka m bịakwute unu kwuo ihe a niile ná ntị unu.”+
7 Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị irube isi n’okwu+ Jehova kwuru site n’ọnụ ndị amụma+ oge mbụ, mgbe Jeruselem bụ ebe ndị mmadụ bi, mgbe udo dịkwa na ya, ya na obodo ya niile gbara ya gburugburu, mgbe Negeb+ na Shefila+ bụkwa ebe ndị mmadụ bi?’”