17 Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma,+ ire ọ bụla nke ga-ekwu okwu megide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe.+ Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova,+ ezi omume ha si n’ebe m nọ,” ka Jehova kwuru.+
22 M ga-akwatukwa ocheeze nke alaeze dị iche iche, mee ka ike alaeze nke mba+ dị iche iche laa n’iyi; m ga-akwatukwa ụgbọ ịnyịnya+ na ndị na-agba ha, ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-anwụkwa, onye ọ bụla site ná mma agha nwanne ya.’”+
14 N’eziokwu, ha bụ okwu si n’aka+ ndị mmụọ ọjọọ ma na-eme ihe ịrịba ama,+ ha na-agakwurukwa ndị eze+ nke elu ụwa dum mmadụ bi,+ ka ha kpọkọta ha maka ibu agha+ nke oké ụbọchị+ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+