33 N’ụbọchị ahụ, ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa.+ A gaghị akwara ha ákwá arịrị, a gaghịkwa achịkọta ha ma ọ bụ lie ha.+ Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.’+
11 Jehova ga-ekwukwa okwu+ n’ihu ụsụụ ndị agha ya,+ n’ihi na ndị agha ya dị ọtụtụ nke ukwuu.+ N’ihi na onye ahụ nke na-emezu okwu ya dị ike; n’ihi na ụbọchị Jehova bụ oké ụbọchị,+ ọ dịkwa oké egwu, ònyekwa pụrụ iguzo mgbe ọ bịara?”+
15 Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị oké iwe, ụbọchị ahụhụ na nke nhụjuanya,+ ụbọchị oké ifufe na nke ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na nke itiri,+ ụbọchị ígwé ojii na nke oké ọchịchịrị,
12 na-echere+ ma na-eburu ọbịbịa* nke ụbọchị Jehova n’uche,+ nke ga-eme ka eluigwe ree ọkụ wee gbazee,+ ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa ga-adịkwa oké ọkụ wee gbazee!