20 Lee anya na Zayọn,+ bụ́ obodo anyị na-anọ eme ememme!+ Anya gị ga-ahụ Jeruselem, bụ́ ebe obibi nke na-enweghị nsogbu, ụlọikwuu nke ọ na-adịghị onye ga-ebupụ ya.+ Ọ dịghị mgbe a ga-efopụ mkpọ́ ụlọikwuu ya efopụ, a gaghịkwa adọbi eriri ya ọ bụla.+
26 Onye na-eme ka okwu ohu ya mezuo, Onye na-emezucha atụmatụ nke ndị ozi ya;+ Onye na-ekwu banyere Jeruselem, sị, ‘A ga-ebi na ya,’+ kwuokwa banyere obodo ndị dị na Juda, sị, ‘A ga-ewughachi ha,+ m ga-ewu ebe ya niile tọgbọrọ n’efu’;+
10 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘N’ebe a nke unu ga na-asị na ọ bụ mkpọmkpọ ebe nke mmadụ na anụ ụlọ na-anọghị, n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem bụ́ ndị e mere ka ha tọgbọrọ n’efu,+ nke mmadụ na-anọghị, nke na-enweghị onye bi ya, nke anụ ụlọ na-anọghịkwa, a ka ga-anụ+
4 “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ndị agadi nwoke na ndị agadi nwaanyị ga-anọdụ ala n’ámá ndị dị na Jeruselem,+ onye ọ bụla ga-eji mkpara+ ya n’aka n’ihi ịdị ogologo ndụ.