5 “Ọ bụrụ na ụmụnne bikọta ọnụ, otu n’ime ha anwụọ n’enweghị nwa nwoke, nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ agaghị abụ nwunye nwoke ọzọ n’èzí. Nwanne di ya ga-agakwuru ya, ọ ga-akpọrọkwa ya ka ọ bụrụ nwunye ya wee kuchie ya.+
13 Nọrọ n’ebe a n’abalị a, ọ bụrụ na o ruo ụtụtụ, ọ bụrụ na ọ gbara gị,+ ọ dị mma! Ya gbarawa. Ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịgbara gị, dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ mụ onwe m ga-agbara gị. Dinara ala ruo ụtụtụ.”
19 “Onye Ozizi, Mozis deere anyị akwụkwọ na ọ bụrụ na nwanne mmadụ anwụọ wee hapụ nwunye ya, ma ọ mụtaghị nwa, nwanne ya nwoke+ kwesịrị ịkpọrọ nwunye ya wee si n’aka ya mụtara nwanne ya nwoke nwa.+