15Ozugbo o ruru n’isi ụtụtụ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ, ya bụ, Sanhedrin dum, gbara izu.+ Ha wee kee Jizọs agbụ ma kpụrụ ya pụọ wee nyefee ya n’aka Paịlet.+
66 E mesịa, mgbe chi bọrọ, ìgwè ndị okenye ndị Juu, ma ndị isi nchụàjà ma ndị odeakwụkwọ, zukọtara,+ ha wee kpụrụ ya banye n’ụlọ nzukọ Sanhedrin ha, sị:+
28 Ha wee duru Jizọs si n’ụlọ Keyafas gaa n’obí gọvanọ.+ Ọ bụzi ụtụtụ. Ma ha onwe ha abanyeghị n’obí gọvanọ ahụ, ka ha wee ghara ịbụ ndị e merụrụ,+ kama ka ha nwee ike iri nri ememme ngabiga.