8 “Ya mere, ana m asị unu, Onye ọ bụla nke na-ekwupụta+ na mụ na ya dị n’otu n’ihu ndị mmadụ, Nwa nke mmadụ ga-ekwupụtakwa na ya na ya dị n’otu n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke.+
9 N’ihi na ọ bụrụ na ị ga-eji ‘ọnụ gị’ kwusaa ‘okwu ahụ’ n’ihu ọha,+ na Jizọs bụ Onyenwe anyị,+ ma na-enwe okwukwe n’obi gị na Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya,+ a ga-azọpụta gị.+
5 A ga-esikwa otú ahụ yiwe onye meriri emeri+ uwe elu nke na-acha ọcha;+ m gaghịkwa ehichapụ aha ya ma ọlị n’akwụkwọ nke ndụ,+ kama m ga-ekwupụta aha ya n’ihu Nna m+ na n’ihu ndị mmụọ ozi ya.+