10 Mee ka obi ndị a ghara ịnabata ihe,+ meekwa ka ntị ha kpọchie akpọchie,+ nyachiekwa anya ha, ka ha wee ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji ntị ha nụ ihe, ka obi ha gharakwa ịghọta ihe, ka ha wee ghara ichegharị, e wee gwọọ ha.”+
2 “Nwa nke mmadụ, ọ bụ n’etiti ụlọ na-enupụ isi+ ka i bi, ndị nwere anya e ji ahụ ụzọ ma ha adịghị ahụ ụzọ,+ ndị nwere ntị e ji anụ ihe ma ha adịghị anụ ihe,+ n’ihi na ha bụ ụlọ na-enupụ isi.+
12 ka ha wee lee anya ma ghara ịhụ ụzọ, ọ bụ ezie na ha na-ele anya, ka ha wee nụkwa ma ghara ịghọta ihe ọ pụtara, ọ bụ ezie na ha na-anụ ihe, ka ọ gharakwa inwe mgbe ha ga-agbanwe, e wee gbaghara ha.”+