Ezikiel
12 Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 2 “Nwa nke mmadụ, ọ bụ n’etiti ụlọ na-enupụ isi+ ka i bi, ndị nwere anya e ji ahụ ụzọ ma ha adịghị ahụ ụzọ,+ ndị nwere ntị e ji anụ ihe ma ha adịghị anụ ihe,+ n’ihi na ha bụ ụlọ na-enupụ isi.+ 3 Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, kwakọta ngwongwo ị ga-ebu pụọ dị ka onye a dọọrọ n’agha, buru ya pụọ n’ihu ha n’ehihie dị ka onye a dọọrọ n’agha, si n’obodo gị pụọ n’ihu ha gaa n’obodo ọzọ dị ka onye a dọọrọ n’agha. Ma eleghị anya, ha ga-ahụ ya, ọ bụ ezie na ha bụ ụlọ na-enupụ isi.+ 4 Kwapụta ngwongwo gị n’ehihie n’ihu ha dị ka ngwongwo onye a dọọrọ n’agha, gị onwe gị ga-apụkwa n’uhuruchi n’ihu ha dị ka ndị a na-akpọpụta ka a dọrọ n’agha.+
5 “N’ihu ha, gwupuo mgbidi, si ebe ahụ bufee ngwongwo gị.+ 6 Buru ngwongwo ndị ahụ n’ubu gị n’ihu ha. Buru ya pụọ mgbe ọchịchịrị gbara. Kpuchie ihu gị ka ị ghara ịhụ ala anya, n’ihi na m na-eme ka ị bụụrụ ụlọ Izrel+ ihe àmà nke ihe ga-eme n’ọdịnihu.”+
7 M wee mee nnọọ otú ahụ e nyere m n’iwu.+ M bupụtara ngwongwo m n’ehihie, dị nnọọ ka ngwongwo onye a dọọrọ n’agha; n’anyasị, m ji aka m gwupuo mgbidi. M buuru ya pụọ mgbe ọchịchịrị gbara. Ebu m ya n’ubu m, n’ihu ha.
8 Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ n’ụtụtụ, sị: 9 “Nwa nke mmadụ, ọ̀ bụ na ndị ụlọ Izrel, bụ́ ụlọ na-enupụ isi,+ asịghị gị, ‘Gịnị ka ị na-eme?’ 10 Sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ dị okwu e kwuru banyere otu onyeisi,+ bụ́ okwu e kwuru megide ndị Jeruselem na ụlọ Izrel dum bụ́ ndị nọ n’etiti ha.”’
11 “Kwuo, sị, ‘Abụụrụ m unu ihe àmà nke ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ Dị nnọọ ka m mere, otú ahụ ka a ga-eme ha. A ga-eme ka ha gaa biri n’ala ọzọ, a ga-adọrọ ha n’agha.+ 12 Onyeisi nke nọ n’etiti ha ga-eburu ngwongwo ya n’ubu pụọ mgbe ọchịchịrị gbara; ha ga-egwupu mgbidi bú ebe ha ga-esi buru ya pụọ.+ Ọ ga-ekpuchi ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ ala.’ 13 M ga-agbasakwa ụgbụ m n’elu ya, m ga-eji ụgbụ m ji achụ nta jide ya;+ m ga-adọrọ ya bịa Babịlọn, n’ala ndị Kaldia,+ ma ọ gaghị ahụ ala ahụ; n’ebe ahụkwa ka ọ ga-anwụ.+ 14 Ndị niile nọ ya gburugburu dị ka ndị enyemaka, na ìgwè ndị agha ya niile, ka m ga-achụsasị ebe niile;*+ m ga-amịrị mma agha chụwa ha.+ 15 Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m chụsasịrị ha n’etiti mba dị iche iche, meekwa ka ha gbasasịa n’ala dị iche iche.+ 16 M ga-emekwa ka mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe gbufọ ndị ikom ole na ole n’ime ha,+ ka ha wee kọọ ihe arụ+ ha niile n’etiti mba dị iche iche ha ga-abanye;+ ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.”
17 Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 18 “Nwa nke mmadụ, ị ga na-ama jijiji mgbe ị na-eri nri gị, ị ga-aṅụkwa mmiri gị n’ahụ́ erughị ala nakwa ná nchegbu.+ 19 Ị ga-asịkwa ndị ala a, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ndị bi na Jeruselem, n’ala Izrel:+ “Ha ga-eri nri ha ná nchegbu, ọ bụkwa n’ụjọ ka ha ga-aṅụ mmiri ha, ka ala ya wee tọgbọrọ n’efu+ n’ihi ime ihe ike nke ndị niile bi n’ime ya.+ 20 A ga-alakwa obodo ndị e bi ebi n’iyi,+ ala a ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu;+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova”’”+
21 Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 22 “Nwa nke mmadụ, gịnị bụ isi ilu a unu na-atụ n’ala Izrel,+ sị, ‘Oge agawala,+ ọhụụ niile alawokwa n’iyi’?+ 23 Ya mere, sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “M ga-eme ka a kwụsị ịtụ ilu a, ha agakwaghị atụ ya dị ka ilu n’Izrel.”’+ Ma gwa ha, sị, ‘Oge eruwo nso,+ mmezu nke ihe a hụrụ n’ọhụụ niile eruwokwa nso.’ 24 N’ihi na a gakwaghị ahụ ọhụụ na-abaghị uru,+ a gakwaghị enwe ndị na-agba afa, bụ́ ndị nwere ire ụtọ, n’etiti ụlọ Izrel.+ 25 ‘“N’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova, ga-ekwu ihe m ga-ekwu, a ga-emekwa ya.+ A gakwaghị agbatị oge ọ ga-emezu,+ n’ihi na n’ụbọchị unu,+ unu ụlọ na-enupụ isi, m ga-ekwu okwu, meekwa ya,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’”
26 Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 27 “Nwa nke mmadụ, lee! ndị ụlọ Izrel na-asị, ‘Mgbe ọhụụ nke ọ na-ahụ ga-emezu ka dị anya, ọ na-ebukwa amụma banyere oge ka dị anya.’+ 28 Ya mere, sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “‘A gakwaghị agbatị oge ihe ọ bụla m kwuru ga-emezu.+ Okwu ọ bụla m ga-ekwu, a ga-eme ya,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”’”+