28 Ndị gbanahụrụ mma agha ga-esi n’ala Ijipt laghachi n’ala Juda, ha ga-adị ole na ole;+ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ́ ndị na-abata n’ala Ijipt ka ha biri n’ime ya dị ka ndị ọbịa, ga-amata onye okwu ya ga-emezu, ihe m kwuru ka ọ̀ bụ ihe ha kwuru.”’”+
6 o jikwa Onye ahụ nke na-adị ndụ+ ruo mgbe niile ebighị ebi,+ bụ́ onye kere eluigwe na ihe ndị dị n’ime ya, na ụwa+ na ihe ndị dị n’ime ya,+ na oké osimiri na ihe ndị dị n’ime ya, ṅụọ iyi, sị: “A gakwaghị egbu oge;+