13 Ewetawo m ezi omume m nso.+ Ọ dịghị n’ebe dị anya,+ nzọpụta m agaghịkwa abịa mgbe oge gafeworo.+ M ga-eme ka e nwee nzọpụta na Zayọn, meekwa ka Izrel nweta ịma mma m.”+
25 ‘“N’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova, ga-ekwu ihe m ga-ekwu, a ga-emekwa ya.+ A gakwaghị agbatị oge ọ ga-emezu,+ n’ihi na n’ụbọchị unu,+ unu ụlọ na-enupụ isi, m ga-ekwu okwu, meekwa ya,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’”
3 N’ihi na ọhụụ a bụ maka oge a kara aka,+ o jikwa ọsọ na-eru ọgwụgwụ ya, ọ gaghị agha ụgha. Ọ bụrụgodị na o gbuo oge, na-atụ anya ya; n’ihi na ọ ga-emezurịrị.+ Ọ gaghị anọ ọdụ.