14 Unu sịkwara, ‘Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?’+ Ọ bụ n’ihi na Jehova agbawo akaebe n’etiti gị na nwunye ị lụrụ n’okorobịa,+ bụ́ onye ị ghọworo aghụghọ, ọ bụ ezie na ọ bụ nwaanyị gị nakwa nwunye gị na ya gbara ndụ.+
32 Otú ọ dị, ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko,+ ọ na-eme ya ka ọ bụrụ onye nwere ike ịdaba n’ịkwa iko,+ onye ọ bụla nke lụkwara nwaanyị a gbara alụkwaghịm na-akwa iko.+
3 N’ihi ya, mgbe di ya nọ ndụ, a ga-akpọ ya nwaanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ ghọọ nwunye nwoke ọzọ.+ Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, o siwo n’iwu nke di ya pụọ nwere onwe ya, nke mere na ọ bụghị nwaanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ ghọọ nwunye nwoke ọzọ.+
4 Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ,+ n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.+