29 Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo.+ N’ihi na ọ baara gị uru ka otu akụkụ ahụ́ gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị dum+ na Gehena.
9 Ọ bụrụkwa na anya gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya ma tụfuo ya; ọ kaara gị mma ibu otu anya nweta ndụ kama inwe anya abụọ e wee tụba gị n’ime Gehena* bụ́ ebe ọkụ na-ere.+
13 n’ihi na ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dị ka anụ ahụ́ si chọọ, unu aghaghị ịnwụ;+ ma ọ bụrụ na unu emee ka omume niile nke ahụ́ nwụọ+ site na mmụọ nsọ, unu ga-adị ndụ.