23 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ka onye maara ihe ghara iji amamihe ya na-anya isi,+ ka dike ghara iji ike ya na-anya isi.+ Ka ọgaranya ghara iji akụnụba ya na-anya isi.”+
17 Na-enye ndị bara ọgaranya+ n’usoro ihe dị ugbu a iwu ka ha ghara inwe anya dị elu,+ ka ha nweekwa olileanya, ọ bụghị n’akụnụba ndị a na-ejighị n’aka,+ kama n’ebe Chineke nọ bụ́ onye na-enye anyị ihe niile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ;+